Si ndewo nye akaụntụ nwa obere oge: njikọrịta aka dị mfe nke nchekwa nzochi ka mma nke ndị editọ n’abanyeghi abanye

Translate this post

Wikimedia Foundation na-ewepụta akaụntụ nwa obere oge maka ndị editọ n’edebanyeghị aha (n’abanyeghi abanye) na ọtụtụ wiki. Ndị ngalaba otu ha nwere ohere ịnwale ma kesaa nkọwa iji melite njirimara ahụ tupu etinye ya na wiki niile n’ime 2025.

N’ọtụtụ wiki, ndezi nke ndị ọrụ n’abanyeghi abanye bụ nke a na-arụtụaka nye IP adreesị ejiri n’oge ebipụtara ndezi ahụ. IP Adressị bụ nọmba pụrụ iche na-achọpụta ngwaọrụ ejikọrọ na ịntanetị. Akaụntụ nwa obere oge bụ ụdị akaụntụ ọhụrụ onye ọrụ dị na wiki iri na abụọ, mana n’afọ ọzọ, ọ ga adị ebe niile. A ga-eji ha rụtụaka ndezi ọhụrụ nke ndị ọrụ n’abanyeghi abanye kama iji IP adreesị . Otú ọ dị, ọ gaghị abụ ihe mgbanwe kpọmkwem. Nke mbụ, ndị ọrụ nwa obere oge ga-enwe ike ịnweta ngwa arụmọrụ ugbu a nke ndị editọ n’abanyeghi abanye enweghị ike ịnweta. Nke abuo, oru ngo Wikimedia ga-aga n’ihu na-eji IP adreesị nke ndị ndezi n’abanyeghi abanye, ma ndị ngalaba otu nwere ahụmahụ ga-anọgide na-enweta ha. Mgbanwe a dị mkpa karịsịa nye ndị editọ n’abanyeghi abanye na onye ọ bụla na-eji IP adreesị mgbe ọ na-egbochi ndị ọrụ mmebi ma na-echekwa wiki n’ozuzu.

Nke a bụ nke mbụ n’ime usoro nke mbipụta ewepụtara maka akaụntụ nwa obere oge. Ọ na-enye nkọwa nke isi ọrụ ahụ, mmetụta dị iche iche nke ndị ọrụ, na atụmatụ maka iwebata mgbanwe na wiki niile. Mbipụta anyị na-esote ga-enye nkọwa ndị ọzọ gbasara otu anyị sirila na-arụkọ ọrụ anyị na ndị ngalaba otu nwere ikike teknụzụ dị elu. N’ịgbaso ndụmọdụ ha, anyị ekesaala ọrụ nye kpomkwem ngwa eji na-arụ ọrụ.


Iwu emebere maka mgbanwe a

Ịgbanwe iwu na ntuzi gbasara nzochi nke ịntanetị na-enye ohere ime ngwa ngwa nye ọrụ Wikimedia iji chebe data nkeonwe nke ọma. Iji gboo mkpa a, Wikimedia Foundation ga-agbanwerịrị ụzọ ndị editọ n’abanyeghi abanye si emekọrịta na Wiki, yana otu esi ejikwa data nkeonwe ha. Ihe a ga-eji mezie nke a bụ iwebata akaụntụ ọrụ nwa obere oge – ọ ga-emeziwanye nzochi nke ndị editọ n’abanyeghi abanye. Iji matakwuo maka mkpa nke akaụntụ nwa obere oge a, lee ngalaba iwu na FAQ anyị yana mmelite 2021 sitere n’aka ndị otu n’ah maka iwu.

Ka akaụntụ nwa obere oge si arụ ọrụ

Akụkọ ibe nwere ndekọ ndezi nke akaụntụ nwa obere oge mere, IP adreesị abụọ, yana onye ọrụ debanyere aha ya(nseta ihuenyo sitere na Serbo-Croatian Wikipedia)

Ọrụ Wikimedia na-enye onye ọ bụla ohere ndezi, ma inwere akaụntụ ma ọ bụ na-inweghị akaụntụ. Nke a bụ otu n’ime ụkpụrụ ntọala anyị. Mgbe emere ndezi site na akaụntụ debanyere aha, a na-arụtụaka na ndezi ya bụ akaụntụ bụ nke a ga ahụ na ndekọ na ibe dị iche iche dị ka Mgbanwe na-adịbeghị anya ma ọ bụ akụkọ gbasara peeji. Mgbe emere ndezi ma enweghị akaụntụ, a ga-ekwupụta ndezi a na akaụntụ nwa obere oge ewepụtara akpaaka. A ga-emepụta akaụntụ nwa obere oge n’aha onye editọ pụrụnụ ma ọ ga-adịru ụbọchị iri itoolu. Ndezi niile sitere n’ otu ngwaọrụ ga abụ nke aga akọwapụta na otu akaụntụ nwa obere oge.

Aha akaụntụ a na-agbaso ụkpụrụ: ~ 2024-1234567 (taịdị, afọ anọ na ya, nọmba). Ọnụọgụ ahụ na-abawanye na-akpaghị aka, nke mere na onye ọrụ na-esote ga-abụ ~ 2024-1234568, na ihe ndị ọzọ. Ndị ọrụ agaghị enwe ike ịhọrọ aha a.

Ọ ga-abụ otu akaụntụ ọ bụrụgodị na IP adreesị agbanweela, ọ gwụla ma onye ọrụ kpochapụrụ kuki ihe nchọgharị ha ma ọ bụ jiri ngwaọrụ dị iche ma ọ bụ ihe nchọgharị weebụ. A ga-echekwa ndekọ nke IP adreesị ejiri n’oge ndezi ọ bụla ụbọchị iri itoolu ka emere ndezi. Naanị ụfọdụ ndị ọrụ banyere abanye ga-enwe ike ịhụ ya.

Ụbọchị iri itoolu ka ụbọchị ịmepe akaụntụ gasiri, kuki ga akwụsị. A ga-aga n’ihu na-akọwapụta ndezi na akaụntụ ya, mana ọ bụrụ na onye njieme ga aga n’ihu na-eme ndezi n’abanyeghi abanye, a ga-ekenye ya akaụntụ nwa obere oge ọhụrụ . Enweghị ike ịtụgharị akaụntụ nwa obere oge ka ọ bụrụ akaụntụ edebanyere edebanye . Iji mụtakwuo maka otu akaụntụ nwa obere oge si arụ ọrụ, lee ibe enyemaka anyị.

Kedu ebe ana-agbanye akaụntụ nwa obere oge

Agbanyela akaụntụ nwa obere oge ugbu a na Wikipedia na: Cantonese, Danish, Igbo, Norwegian bokmål, Romanian, Serbian, Serbo-Croatian, and Swahili, yana na Czech Wikiversity, Italian Wikiquote, Japanese Wikibooks, na Persian Wiktionary.

Kedu ihe nke a pụtara nye ndị ọrụ dị iche iche?

Maka ndị na-agụ akwụkwọ na-enweghị akaụntụ Wikipedia

Ọ dịghị ihe na-agbanwe! Ọ bụrụ na ịnaghị eme ndezi, ịbanyeghị, mana ị na-agụ naanị Wikipedia (ma ọ bụ iji Wikidata, Wikimedia Commons, wdg eme ihe), agaghị enwe ihe dị iche na echiche gị.

Maka ndị Edịtọ n’abanyeghi abanye

Echiche onye ọrụ nwa obere oge maka ibe okwu ha. Enwere akara ngosi na menu onye ọrụ na akuku aka nri elu – ụfọdụ njirimara ndị editọ IP enweghị ohere (nseta ihuenyo sitere na testwiki)
  • Nke a na-abawanye nzochi: ugbu a, ọ bụrụ na ijighị akaụntụ edebanyere aha mee ndezi, mgbe ahụ onye ọ bụla nwere ike ịhụ IP adreesị maka ndezi ndị ị mere, ọbụlagodi ma ụbọchị iri itoolu gachaa. Nke ahụ agaghịkwazi ekwe omume na wiki ndị nwere akaụntụ nwa obere oge.
  • Ọ bụrụ na ị na-eji akaụntụ nwa obere oge mee ndezi site na ebe dị iche iche n’ime ụbọchị iri itoolu gara aga (dịka ọmụmaatụ n’ụlọ ọrụ na n’ụlọ ahịa kọfị), a ga-edekọ akụkọ ihe mere eme na adreesị IP maka ebe ndị ahụ niile, nye otu akaụntụ nwa obere oge. . Ndị ọrụ mezuru ihe achọrọ ga-enwe ike ịlele data a. Ọ bụrụ na nke a na-ebutere gị nsogbu nchekwa ọ bụla, biko kpọtụrụ talktohumanrights at wikimedia dot org maka ndụmọdụ.

Maka ndị ngalaba otu na-emekọrịta ha na ndị editọ n’abanyeghi abanye

Enwere ike ịkpọ ndị ọrụ nwa oge (mkpọturu) na mkparịtaụka, ha ga-enweta ọkwa gbasara ya
  • Ejikọrọ akaụntụ nwa obere oge na ngwaọrụ pụrụ iche. N’iji ya tụnyere, enwere ike ịkekọrịta otu IP adreesị na ngwaọrụ dị iche iche na ndị mmadụ (dịka ọmụmaatụ, ndị dị iche iche na ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ndị na-arụ ọrụ nwere ike inwe otu IP adreesị).
  • Njirimara onye ọrụ nwa obere oge ga-adigidesi ike karịa IP onye ọrụ . Ọ bụrụ na ị hụ ndezi ha, wee dee ozi gbasara ya na ibe okwu ha, onwere isi na onye deziri ya ga-agụ ozi ahụ, ọ bụrụgodị na oge ụfọdụ gafere.
  • Akaụntụ nwa obere oge na-arụ ọrụ yiri akaụntụ debanyere aha ya n’akụkụ ụfọdụ. Anyị nwere ike meere ha atụmatụ ndị ọzọ n’ọdịnihu. Dịka ị na-ahụ na nseta ihuenyo dị n’elu, ndị ọrụ akaụntụ nwa oge ga-enwe ike ịnweta ọkwa. Ọ ga-ekwe omume ikele ha maka ndezigharị ha, ma kpọtụrụ ha na mkparịtaụka, ma kpọọ ha ka ha tinyekwuo aka na Otu a.

For Maka ndị ọrụ na-eji data IP adreesị iji megharịa ma jikwaa wiki

Echiche onye nchịkwa banyere ibe akụkọ ihe mere eme. Njirimara IP gosipụtara ngwa n’akụkụ aha njirimara akaụntụ nwa obere oge (nseta ihuenyo sitere na testwiki)
  • Maka ndị nlebaranya na-esochi ndị nogidesiri ike na imebi ihe, nyochaa mmebi iwu, wdg.: Ndị ọrụ mezuru ihe ndị a chọrọ ga-enwe ike ikpughe IP adreesị ndị ọrụ nwa obere oge yana onyinye aka niile nke akaụntụ nwa obere nyere site na IP adreesị ma ọ bụ nhazi. Ha ga-enwetakwa ozi bara uru gbasara ekele IP adreesị nke njirimara ozi IP. Ewuola ma ọ bụ gbanwee ọtụtụ ngwa ndị ọzọ ka ha na akaụntụ nwa obere oge rụọ ọrụ, gụnyere AbuseFilter, global blocks, ntinye aka ndị ọrụ zuru ụwa ọnụ, na ndị ọzọ.
  • Maka ndị admins na-egbochi ndị editọ abanyeghi abanye:
    • Ọ ga-ekwe omume igbochi ọtụtụ ndị mmetọ site na igbochi naanị akaụntụ nwa obere oge ha. Onye akpọchiri agaghị enwe ike ịmepe akaụntụ nwa obere oge ọhụrụ ngwa ngwa ma ọ bụrụ na onye nchịkwa ahọrọ nhọrọ mgbochi akpaaka.
    • Ọ ka ga-ekwe omume igbochi IP adreesị ma ọ bụ ndakọta IP
  • Anyị na ndị ọrụ ndị ọzọ nwere ikike dị elu na-arụkọ ọrụ, dịka ndị Steward. Site na nkọwa na ajụjụ bara uru sitere n’aka ndị ọrụ a, anyị emelitere ngwaọrụ yana nhazi ọkwa n’akụkụ mmelite ndị a.
  • Agaghị etinyere akaụntụ nwa obere oge ntinyeaka emere tupu ekesaa ya. Na Special:Contribution, ị ga-enwe ike ịhụ ntinyeaka onye ọrụ IP dị ugbu a, mana ọ bụghị nkwado ọhụrụ sitere na akaụntụ nwa obere oge na IP adreesị ahụ. Kama, ndị ọrụ mezuru ihe achọrọ kwesịrị iji Special:IPContributions maka nke a.

Kedu mgbe a ga-etinye akaụntụ nwa obere oge na wikis ọzọ?

  • Dịka anyị kwuru, anyị ewepụtala akaụntụ nwa obere oge na nkeji mbụ nke wiki. A na-akpọ usoro a obere nkesa. Ọ ga-enyere anyị aka ịchọpụta nsogbu ọ bụla ekwesịrị idozi tupu enwee akaụntụ nwa obere oge na wiki ndị ozọ. Anyị kwesịrị ịhụ ka ndị ngalaba otu si emekọrịta na ojiji akaụntụ nwa obere oge, ma ọ bụrụ na ngwa niile dị adị na ngwaọrụ ọhụrụ na-arụ ọrụ, ọ bụrụ na ndị ọrụ nwere ahụmahụ na-arụ ọrụ nke ọma, wdg. Anyị ga na-enyocha mmetụta nke ọrụ a mgbe niile ma na-ekesa akụkọ ahụ kwa oge. Ị nwere ike ịhụ dashboard ọha nwere data metrik ozugbo.
  • Ọ bụrụ na anyị enweghị ọtụtụ ọrụ a na-atụghị anya ya, mgbe ahụ na February 2025, anyị ga-apụta na wiki buru ibu. Anyị na-akpọ nke a nnukwu ohere. Ọ nwere ike ịgụnye ụfọdụ wiki iri kacha elu nke ga-egosipụta mmasị ha (deere anyị akwụkwọ ebe a). Anyị ga agha nhọrọ ibuga na Wikipedia Bekee n’oge ahụ, n’agbanyeghị.
  • Ozọ, n’etiti 2025, anyị ga-ebuga na wiki niile fọdụrụ n’otu usoro ejiri nlezianya hazie. Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị ga na-enye nkwado, nnyochaa metrics, ma dozie nsogbu ka ha na-ebili.

Anyị ga-eme ike anyị niile ịgwa onye ọ bụla o metụtara tupu oge eruo. Ozi gbasara akaụntụ nwa oge ga-adị na Tech News, Diff, blọọgụ ndị ọzọ, ibe wiki dị iche iche, ọkọlọtọ, na ụdị ndị ọzọ. Na ogbako, anyị ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị n’aha anyị na-akpọ ndị bịaranụ ka ha kwuo maka ọrụ a. Na mgbakwunye, anyị na-akpọtụrụ ndị mmekọ na-eme mmemme nkwado ngalaba otu..


Debanye aha na akwụkwọ akụkọ ọhụrụ anyị ka ị nọrọ n’enweta ozi na kọntaktị. Iji mụtakwuo maka ọrụ a, lelee FAQ wee lelee mmelite kachasị ọhụrụ. Gwa anyị okwu na ibe ọrụ anyị ma ọ bụ na mpụga wiki. ka Emesia!

Can you help us translate this article?

In order for this article to reach as many people as possible we would like your help. Can you translate this article to get the message out?