
Kwa afọ, ka Wikimedia Foundation na-amalite atụmatụ anyị kwa afọ maka afọ na-abịa, anyị na-emepụta ndepụta nke mgbanwe n’ewu ewu nke anyị kwenyere na ọ ga egosipụta mmetụta ya nye otu Otu na ọrụ Wikimedia si arụ ọrụ. Anyị na-achọpụta usoro mgbanwe n’ewu ewu dị n’ịntanetị akọwapụtara nke ọma metụtara ebumnuche anyị, dị ka mgbanwe otu na ebe ndị mmadụ si achọ ma na-enye ozi n’ịntanetị, ịrị elu nke ozi na-ezighi ezi na nke n’abụghị eziokwu n’ịntanetị, yana mgbanwe ụkpụrụ nke ndị na-eweta ozi n’ịntanetị. Nnyocha a na-enye anyị ohere ibido atụmatụ anyị site na ajụjụ ntụzịaka a, “Gịnị ka ụwa chọrọ n’aka Wikimedia ugbu a?”
Ajụjụ a bụ ihe na-akpali mkparịtaụka n’ofe nakwa na Otu a. Dị ka ọ dị n’afọ ndị gara aga, usoro mgbanwe ndị n’ewu ewu dị n’okpuru ebe a na-egosi ka nkà na ụzụ, ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba ụwa, na gburugburu ebe obibi anyị dị ugbu a si dị nnọọ iche n’ụbọchị amalitere Wikipedia, yana otu anyị ga-esi nọgharịa ka ọ daba na mgbanwe a nakwa wee mmepe. Nke ọ bụla ga-ahazi atụmatụ anyị kwa afọ nakwa atụmatụ ndị na-emetụta ọdịnihu anyị – site na iji ngwa teknụzụ siri ike chebe ndị Wikimedia na usoro ntụkwasị obi na usoro nchekwa gaa na nnwale na-ewetara ndị na-ege ntị ọdịnaya Wikimedia n’ụzọ ọhụrụ.
Mgbanwe otu nakwa ebe ndị mmadụ sienweta ma n’enyekwa ozi
Inwe ntụkwasị obi na ozi dị n’ịntanetị na-ebelata ma nkwenye n’ihe gbasara ozi bụ eziokwu na nke ekwesiri ịtụkwasị obi na-ekewa. N’afọ gara aga, anyị chọpụtara na ndị o ji eme ihe juputara na ozi ịntanetị ma choọ ka ndị atụkwasịrị obi tulee ozi ndị a. Site na mmalite nke nnyocha Google AI na ngwaahịa ọchụchọ AI ndị ọzọ, ọtụtụ ndị na-achọ ozi na weebụ na-enweta enyemaka site n’aka AI ugbu a. N’agbanyeghị nke ahụ, ọchụchọ nnyere aka AI agafebeghị ụzọ ndị ọzọ ndị mmadụ na-esi enweta ozi (dịka ọmụmaatụ, site na ebe ọchịchọ weebụ omenala ma ọ bụ na nhiwe ọha mmadụ). Otú ọ dị, anyị na-ahụ na mgbanwe n’ewu ewu anyị hụrụ ama n’afọ gara aga nke ịdabere na ndị atụkwasịrị obi na-esiwanye ike: ndị mmadụ na-enwewanye obi abụọ maka ndị isi ihe ọmụma ọdịnala, dị ka ụlọ ọrụ gọọmentị na mgbasa ozi, kama na mbawanye na ọnụ ọgụgụ ndị omee n’ịntanetị, bụ ndị na-enweta mmetụta dị ukwuu na ihe ndị mmadụ kwenyere nakwa nke ha nwere ntụkwasị obi na. Ndị omee n’ịntanetị (dịka, pọdkastị, vloggers) na nhiwe mmekọrịta na-ebute ihe omume dị mkpa karịa dị ka na ntuliaka ndọrọ ndọrọ ọchịchị zuru ụwa ọnụ. Site n’ịchọ ndị omee nwere otu echiche na ọnọdụ igwe mmadụ ka nke ha, ndị mmadụ na-abụrụ ndị ekewapụrụ ekewapụ na nweta ọzị nke na-ekewa nkwenye na eziokwu.
Ndị mmadụ na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-esonye na oghere ịntanetị na-enye njikọ nkwụghachi ụgwọ. Dị ka webụsaịtị na-adabere na ntinye na oge nke ọtụtụ narị puku ndị Wikimedia, anyị na-agbaso usoro mgbanwe n’ewu ewu na otu ndị mmadụ si eme ntinye aka n’ịntanetị. N’afọ gara aga, anyị mere ka ọ pụta ìhè na ndị mmadụ nwere ọtụtụ ụzọ iji kesaa ihe ọmụma n’ịntanetị nwere nkwụghachi ụgwọ. N’afọ a, anyị chọpụtara na ndị mmadụ n’ụwa niile na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-esonye ma na-ekesarịta ihe ọmụma na nka ha na obere otu nwere otụ mmasị (na nhiwe dị ka Facebook, WhatsApp, Reddit, na Discord). Ebe ndị a na-ewu ewu n’ụwa niile ma na-eme ka ndị mmadụ nwee ahụ iru ala ma ha sonye karịa ọwa ọha mmadụ buru ibu. Ndị ọrụ afọ ofufo raara onwe ha nye n’idobe ogbakọ ndị a, na-arụ ọrụ ndị dị mkpa dị ka ijikwa na iduzi ndị bịara ọhụrụ.
Maka ndị na-eto eto karịsịa, egwuregwu aghọọla ihe a na-eme nke na-emegide mgbasa ozi mmekọrịta. Ngalaba otu gbasara egwuregwu emepụtala na nhiwe dị ka Discord na Twitch, ebe ndị mmadụ na-ekekọrịta ihe ma na-emekọ ihe ma sonye – na-ahazi mmemme ma ọ bụ ịhazi ọdịnaya na omume onye ọrụ – ọ bụghị naanị egwuregwu. Otugasị na-etinye uchu n’egwuregwu iji kwalite ntinye aka onye ọrụ na ngwaahịa ndị na-enweghị njikọ, dị ka ngalaba egwuregwu na-aga nke ọma ma na-eto eto nke The New York Times.
Ndị mmadụ nwere oke n’oge ha ji eme ihe omume n’ịntanetị, anyị hụtara nke ahụ dị ka otu ihe kpatara mbelata na ọnụ ọgụgụ ndị ọhụrụ na-edebanye aha dị ka ndị editọ na ọrụ Wikimedia – nke malitere na 2020-2021 ma na-aga n’ihu ruo ugbu a – o nwere ike bụrụ mmetụta mmụba na-eto eto na mkpesa nke isonye na ụfọdụ ebe ndị ọzọ nwere nkwụghachi ụgwọ n’ịntanetị.
Mgbanwe na otu esi ekesa ma na-ahazi ozi n’ịntanetị
Ozi dijitalụ nke mmadụ mebere ma nyochaa bụ ihe echekwabara bara uru karịsịa na agha teknụzụ AI. N’afọ gara aga, anyị kwuru echiche anyi na a ga-eme AI ka ọ bụrụ ngwa agha mmepụta na mgbasa ozi n’ezighi ezi n’ịntanetị. N’afọ a, anyị na-ahụ na [$ 1 ọdịnaya AI dị ala na-efesa ma ọ bụghị naanị n’ịgbasa ozi n’ezighi ezi, kama dịka atụmatụ iji baa ọgaranya ngwa ngwa, ma na-emebiga ihe ókè na ịntanetị]. Ozi ziri ezi nke a pụrụ inwe ntụkwasị obi na ya nke mmadụ na-emepụta aghọwo ihe na-ebelata na ihe dị oké ọnụ ahịa nke Nhiwe teknụzụ na-agbalisi ike ikpochapụ na weebụ ma kesaa site na mmụtaara ọchụchọ ọhụrụ (ma AI na ọchụchọ omenala) na nhiwe ha. Ndị na-ebipụta ọdịnaya intanetị nke mmadụ mepụtara n’ofe ọtụtụ ụlọ ọrụ (dịka ọmụmaatụ, ọtụtụ n’ime isi ụlọọrụ akụkọ na ụlọ ọrụ mgbasa ozi n’ụwa nile) na-azaghachi site na na ikpa nkwekọrịta ikike ọdịnaya ha n’ụlọ ọrụ AI na ịmepụta ebe ịkwụ ụgwọ iji chebe onwe ha pụọ na mmeto. Mgbochi ndị a na-ebelata ohere ịnweta ozi di mma,n’efu, nye ọha na eze.
Mgba nnweta ozi dịịrị onwe ya na nke enyọchara nke ọma bụ ihe ịma aka nnweta nye ọrụ ihe ọmụma na ndị na-nyere aka. N’afọ gara aga, anyị mere ka ọ pụta ìhè na ụkpụrụ zuru ụwa ọnụ na-ebute ihe ịma aka nye ọrụ nkesa ozi ịntanetị nke dịgasị iche site na ikike. N’afọ a, ihe ịma aka ịkesa ozi enyochara nke ọma, nke dịịrị onwe ya n’ịntanetị abawanyela nke ukwuu. Nkwekọrịta ọha na eze gburugburu na echiche metụtara ihe dị ka “eziokwu” na “ịdịịrị onwe iche” na-esiwanye ike site na nkewa na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ndị otu nwere mmasị pụrụ iche, ndị na-eme ihe ike, na ụfọdụ ndị gọọmentị na-eleda ntụkwasị obi nke ihe si na ịntanetị na-adabaghị nkwenye ha. Ndị ọzọ na-agbalịkwa imechi ebe esi enweta ozi site na ịgba akwụkwọ iji kpagbuo ma ọ bụ merie onye akwadoghi ha.
N’ụwa niile, ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke iwu ndị na-achọ ịhazi usoro teknụzụ dị n’ịntanetị adịghị enye ohere maka Otu na-adịghị akwụ ụgwọ nke dị na mmasị ọha, dị ka atụmatụ sayensị mepere emepe, ihe ọmụma nke igwe mmadụ na ebe nchekwa ihe nketa omenala, na ebe nchekwa ịntanetị. Iwu Intaneti nke Otu ihe-dị onye ọbụla mma nwere ike bụrụ ihe ịma aka n’ihu nye ndị ntinye aka na nzuzo nke ndị na-ege ntị na nhiwe ndị a, ma buso omume imezi ọdịnaya otu agha. Dịka ọmụmaatụ, iwu nke ga-amanye nhiwe inyochaa njirimara ma soo omume nke ndị ọbịa ma ọ bụ ndị nnyere aka nwere ike itinye nzuzo na nchekwa ndị mmadụ ịnweta ma ọ bụ kesaa ozi na nsogbu. Iwu na-atụ anya nhiwe iwepụ ọdịnaya ahụrụ dị ka ozi na-ezighi ma sonye ikwado ihe nchekwa arụnyere iji lebara ozi na-ezighi ezi nakwa nhiwe na-arụ ọrụ site na nkwenye otu, ma họrọ ihe ziri ezi kama ịhọrọ nnweta ego.
Kedu ihe na-esote yana otu ị ga-esi sonye na mkparịtaụka
Dị ka o si dị na ozi anyị gara aga nye ndị Otu anyị banyere ọnọdụ mgbanwe n’ewu ewu, nke a abụghị ndepụta zuru oke nke ihe ịma aka na ohere chere Otu anyị anyị ihu, kama ọ bụ ụzọ isi malite mkparịtaụka na ịkwado otu anyị ga-esi nye ihe ụwa chọrọ n’aka anyị ugbu a ka anyị na-amalite ịhazi atụmatụ maka afọ mmefu ego na-esote. N’afọ gara aga, onye isi ngwaahịa na teknụzụ Selena Deckelmann kpọrọ ndị Otu anyị zuru ụwa ọnụ ka ha kwupụta mgbanwe n’ewu ewu zuru ụwa ọnụ na mgbanwe ndị kacha ha mkpa – anyị na-agba gị ume ka ị gaa n’ihu na mkparịtaụka a na ibe okwu a. N’ime ọnwa ndị na-abịa, Wikimedia Foundation ga-ebipụta atụmatụ ya kwa afọ iji wepụta ọrụ anyị tụrụ aro maka afọ na-abịa na nzaghachi na mgbanwe n’ewu ewu ndị a. Ụfọdụ ọrụ amalitelarị; dịka ọmụmaatụ, iji lebara mbelata nke ndị ndezi ọhụrụ, anyị na-agbakwunye ụdị ọhụrụ “nlebaranya ndezi,” usoro ọrụ nwere ọgụgụ isi nke na-eme ka ndezi mkpanaka dị elu ma dị mfe maka ndị bịara ọhụrụ ma na-abawanye ohere ha ịga n’ihu na-enye aka. Anyị na-atụ anya mkparịtaụka ndị ngalaba otu anyị ndị ọzọ gbasara otu anyị nwere ike isi chebe ma kwalite ọrụ ihe ọmụma n’efu anyi nye mmekọrịta ọha na eze na-agbanwe agbanwe.

Can you help us translate this article?
In order for this article to reach as many people as possible we would like your help. Can you translate this article to get the message out?
Start translation