Iwepụta ndepụta atụmatụ Wikimedia Foundation maka afọ 2026-2027

Translate this post

E bipụtala atụmatụ afọ nke Wikimedia Foundation maka afọ ntinye ego n’ọrụ nke 2026–2027. Ozi a na-arụtụaka gbasara nchịkọta ndị isi mere. A na-enye ohere ị lebaanya na ndepụta zuru oke na Meta-Wiki ma nye nzaghachi gị na ibe mkparịta ụka n’asụsụ ọ bụla.

Nke Dietmar Rabich – Ọrụ m, CC BY-SA 4.0 Dülmen, Börnste, Teiche in der Heubachniederung, Baum

Gịnị ka ụwa na-atụ anya n’aka anyị ugbu a? 

Ịntanetị nọ n’ọnọdụ mgbanwe. Mgbanwe juputara ebe niile nke Wikimedia Foundation na ndị ọrụ afọ ofufo na-esochi kemgbe ọtụtụ afọ gara aga a bụghịzi nke dị anya maọbụ bụru nke a na-eche n’echiche; ha na-emetụta Wikipedia na ọrụ Wikimedia ugbu a. Wikipedia na-ahụ mbelata na nlebaanya nke peeji na  ogo ọchichọ ndị mbata site na Google, yana mmụba a na-ahụtụbeghị mbụ nke nkwonkwo bot. Anyị kwenyere na nke a abụghị ihe ga-adị nwa oge, kama ọ bụ mgbanwe nhazi. Ụwa a chọrọ Wikimedia Foundation na Otu anyị ka ha gbanwee ma nabata mgbanwe.

Ọrụ Wikimedia ka dị oke mkpa. N’oge iri elu nke akụkọ na-ezighi ezi na ọdịnaya AI atụkwasịghị obi, Wikipedia na-aga n’ihu na-enye ihe ọmụma dị mkpa na gburu gburu weebụ—bụ ”mpaghara eziokwu ntanetị nke na-ejikọta ụwa dijitalụ niile ọnụ.” [Ebe e si nweta ozi] Mana ọ bụ ezie na ọdịnaya ndị ọrụ afọ ofufo kere ka ”dị mkpa” nye ụwa, ọ na-adịwanyezi ”obere” na mpúta ihe, niihi ka ndị mmadụ si ejizi ozi sitere na nchịkọta AI, chatbots na ụdị ndị ọzọ nke iji ndị ọzọ eme ihe.

Nke a na-akpalite ajụjụ dị mkpa nye Otu Wikimedia:

  • Mbata nkwoko ozi: Kedu ka anyị ga-esi zaghachi omume gbasara mbelata nke nleba anya nke peeji, mbelata nke mpụta ihe na mgbanwe nhazi nke ogo ntụnye aka ọchụchọ?
  • Ijigharị mee ihe ebe bara uru : Kedu ka iji ọdịnaya Wikimedia eme ihe n’ụzọ na-adịgide adịgide si dị, yana kedu ka anyị si e chebe akụrụngwa anyị maka mmebi?
  • Mpụtara omume mmadụ: Gịnị bụ uru pụrụ iche Wikipedia nwere n’ụwa nke ọdịnaya sitere na AI na mmụtara “|zero-click“? Kedu ka anyị ga-esi kwalite ntinye ike pụrụ iche nke otu anyị zuru ụwa ọnụ?
  • Ichebe ihe ejirimara anyị: Kedu ka anyị ga-esi chebe ihe njirimara ndị na-enye aka na njirimara inweta ihe na Wikipedia?
  •  Nkwụdosike ogologo oge: Kedu ka anyị ga-esi nyere Wikipedia na ọrụ ndị a aka ịga nke ọma ruo afọ iri abụọ na ise ọzọ– nakwa ruo mgbe ebighị ebi?

Ịnwe ihe ịga nke ọma na Wiki na karịa ofe Wiki

Anyị kwenyere na agamnihu Wikipedia dabeere na ihe abụọ na-arụkọ ọrụ ọnụ: ime nke ọma na wiki nakwa gafee wiki. Nke ahụ pụtara itinyesi uchu ike na ahụmịhe ebe a na-elegara anya na weebụsaịtị na ngwa anyị nke ndị ọgụụ, ndị na-enye onyinye na ndị ntinye aka ga ahụ n’anya ma lọghachi na ya. Na ụdị ojiji ga-adịgidesike nke na-erute ndị oji ọrụ anyị eme ihe ebe ha nọ, ma na-ewebata uru na ndị ga-enye aka n’ọdịnihu na Wikipedia — ọ bụghị naanị n’ụdị ọchịchọ. Iji mee nke ọma ma nọgide ị bụ mmasị na mgbanwe ọhụrụ a, anyị chọrọ ka Wikipedia mee nke ọma ma na wiki nakwa gafee wiki.

Ebumnuche Foundation nke afọ 2026-27

Kedu ka anyị ga-esi mee nke ahụ? Site n’ilekwasị anya na nlekwasị anya anọ dị mkpa na 2026-27: 

  1. Mee ka ịmara anyị bawanye. Mee mbata saịtị anyị ka ọ dịwanye ukwuu karịa usoro ọchịchọ ogo mbụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasentị iri itoolu nke ndị ọbịa Wikipedia bara saịtị anyị site na nchọta Google. Njem mbata site n’ogo a bụ “n’efu” na-ebelata ugbu a — mgbanwe na-emetụta ndị mbipụta na gburu gburu ịntanetị, ọ bụghị naanị Wikipedia. Nke ahụ pụtara na anyị kwesịrị ịzụlite usoro ọhụrụ ịbata saitị anyị (dịka ọmụmaatụ, isi mmalite ntụaka ọhụrụ na ntinye ngwa mkpanaka) na mepụta isi mbata saịtị anyị ka anyị ghara ịdabere na otu isi mbata. Ndị mmadụ nwere ike ghara ịhụ ọdịnaya Wikimedia ọzọ dịka ha si emebu, nke na-emetụta mpụta ihe ya n’ozuzu, na nzaghachi, mbelata mnweta ihe na mkpali onye ndezi. Nke a ga-achọ ntinye ego na ụzọ ọhụrụ (bụ nke siri ike ma dị oke ọnụ) iji rute ndị ọgụụ n’ọdịnihu, ndị ndezi na ndị na-enye aka.
  2. Kwadowanye Mmekọrịta ntinye aka miri emi. Kwado ndị na-eme ntinye aka anyị ma mee ka ndị na-agụ akwụkwọ anyị bụrụ ndị ọgụụ kwa mgbe, ndị ndezi akụkọ na ndị na-enye onyinye. Ọtụtụ ndị ọrụ Wikipedia na a bụ ndị na-abata n’obere oge, chọta otu eziokwu, ma pụọ. Anyị kwesịrị ime ka mmụtara ony ọgụụ dịkwuo mma ka ndị na-agụ akwụkwọ obere oge wee laghachi, ghọọ ndị na-agụ akwụkwọ kwa mgbe, ma too ghọọ ndị ndezi akụkọ na ndị na-enye onyinye ebe ọ dị ọtụtụ. Na gburu gburu ebe mbata ọ bụla dị mkpa karịa, anyị ga-elekwasị anya na ọwa ndị na-ege ntị (lee n’okpuru) nke na-eweghachi ndị mmadụ site na ọdịnaya “na-abụghị wiki” bata na mmụtara “nke wiki”, na-eme ka ndị na-agụ akwụkwọ obere mgbe bụrụ ndị na-agụ akwụkwọ kwa mgbe, ma na-eme ka ndị ọgụụ kwa mgbe a bụrụ ndị sonyere, ndị na-enye onyinye, na ọgbọ ọhụrụ nke ndị ndu otu.
  3. Chekwaba ọrụ anyị: Kwado ma chebe ihe ejirimara anyị. Ndị ọrụ afọ ofufo na ụkpụrụ Wikipedia na-enwe ihe ịma aka. Anyị ga-enye ndị ọrụ afọ ofufo nkwado nchekwa na iwu ha chọrọ, ma chebe echiche nke enweghi ihe elekwasịrị anya n’ụwa ebe a na-ahụ nrụrịaka banyere eziokwu. Anyị ga-eme ka nchebe nke akụrụngwa Wikimedia sikwuo ike site pụọ n’aka bot, ma dabere na iji ọrụ ndị ọzọ eme ihe nke na-eme ka abamuru laghachi na Wikipedia, ọ bụghị site n’ochịchọ nke mbata.

Ebumnuche ndị a bụ nke ebumnuche nke anọ na-eme ka ha nwee ike:: 

  1. Wụlite ịdị ngwa na nkwudosike: Kwado ndị mmadụ na usoro na-akwado ọrụ a. Mee ka adịmgwa na arụmọrụ dịkwuo mma n’ebe ndị ọrụ, sistemụ na akụrụngwa teknụzụ nke Foundation nọ. Ebumnuche a gụnyere ọrụ anyị ga-arụ iji nweta nkwado ego dị mkpa iji mezuo ọrụ anyị, gụnyere ịnọgide na-akwalite ọtụtụ ụzọ isi nweta ego dịka Wikimedia Enterprise na Endowment iji chebe ndịgide ọrụ Wikimedia n’ọdịnihu.

Kedu ihe kpatara e ji a gbaso usoro a? 

Mgbanwe n’ụzọ mbata saitị anyị na iji ọdịnaya eme ihe pụtara na ndị na-agụ akwụkwọ n’ọdịnihu, ndị na-enye onyinye na ndị na-enye aka ga-abata na Wikipedia n’ụzọ dị iche karịa ka ọ dị na mbụ. Atụmatụ ntuziaka Wikimedia nke 2017 — iji jee ozi dị ka “akụrụngwa dị mkpa nke gburugburu ebe ihe ọmụma n’efu” — bụ nke emezuola nke ukwuu. Mana ịghọ “akụrụngwa dị mkpa” naanị nwere ike ọ gaghị ezu iji chekwaa ọdịnihu nke ihe ọmụma n’efu. Ajụjụ ugbu a a bụrụ otu a ga-esi soo ọrụ ahụ n’ụzọ ndị na-echebe ihe ejirimara onye nnyere aka na Wikipedia, isi ụkpụrụ, na nkwado ndịgide ego. Ka anyị na-aga n’ihu na-abụ ndị Atụmatụ ntuziaka 2030 nke Otu na-agbaziri, isokwunye usoro mgbanwe ụwa niile Otu anyị na-eche ihu ugbu a ga-achọ ka anyị dabere nke ukwuu na ntuziaka iji “nyochaa, Megharịa, ma ịtụghari

Ọrụ Wikimedia anyị kacha apụta ihe ma bụrụ nke e jikarị eme ihe bụ Wikipedia. Maka afọ na-abịa, anyị ga-ewulite ọrụ ntọala Wikipedia na gburugburu ebe ozi iji mee ka mpụta ihe na mbata ọdịnaya Wikimedia dịkwuo mma. Nke a gụnyere mgbalị iji mee ka mbata saịtị Wikipedia dịkwuo elu, ime ka nkwado nye ndị ndezi dịkwuo elu, na inye Ndị Ọrụ ikike agbakwunyere ngwaọrụ na nkwado ha chọrọ ka mma n’agbanyeghị ihe ịma aka na-etowanye. Site n’itinye ego “gafee ofe wiki” iji mee ka ndị na-agụ akwụkwọ ọhụrụ, ndị na-enye aka na ndị na-enye onyinye laghachi na Wikipedia, anyị nwere ike inye aka hụ na ọrụ Wikimedia nọgidere na-adịgidesike ebe ọ metụtara ego, enwem ntụkwasị obi na mmekọrịta mmadụ na ibe ya, adịm mkpa nye ọhanaeze ma nwee nnwere onwe nhazi.

 Site dịka ndị na-agụ akwụkwọ gaa dịka ndị nnyere aka na ndị na-enye onyinye: usoro ndị na-ege ntị

Iji mee ka ndị na-agụ akwụkwọ obere oge bụrụ ndị na-agụ akwụkwọ kwa mgbe, ndị ndezi akụkọ na ndị na-enye onyinye na ogo dị elu, anyị ga-elekwasị anya n’iwega ndị mmadụ site na usoro ndị na-ege ntị nke na-eji nnwale ezubere iche, mmezi ahụmịhe onye ọrụ, na usoro na nzọụkwụ ọ bụla iji mee ka ndị ahịa nkiti bụrụ ndị nsonye.

Oke ohere a pụtara ihe. Anyị na-eme atụmatụ na ihe dị ka ijeri ise ndị na-eji ịntanetị na-eji ọdịnaya Wikipedia n’ụdị ụfọdụ, maọbụ na saịtị anyị maọbụ site na iji ndị ọzọ eme ihe. N’ime ha, ijeri atọ na ụma atọ maara na Wikipedia dị. Ihe dị ka otu ijeri na ụma ise — bụ ihe dị ka pasent iri abụọ na asaa nke ndị na-eji ịntanetị niile — na-agụ ọdịnaya Wikipedia na wiki kwa ọnwa.

Ihe osise: usoro ndị na-ege ntị ugbu a
“Gafee Wiki”
Ndị niile na-eji ịntanetị eme ihe: ihe dị ka ijeri ise na ụma ise
Ndị na-eji ọdịnaya Wikipedia mee ihe ọzọ: bụ ihe dịka ijeri ise na ụma efu
Ndị maara Wikipedia: ihe dị ka ijeri atọ na ụma atọ
“Na Wiki”
Ndị na-agụ akwụkwọ: ihe dị ka otu ijeri na ụma ise (pasent iri abụọ na asaa nke ndị na-eji ịntanetị eme ihe)
Ndị na-enye onyinye: ihe dị ka nde asaa na ụma asaa (0.51% nke ndị ọgụụ)
Ndị ndezi: ihe dị ka narị puku abụọ na iri asaa na atọ (0.02% nke ndị ọgụụ)

Nke a na-enye Wikipedia nnukwu uru atụmatụ iji nyere anyị aka ịgafe oge mgbanwe a. Mana anyị ga-eji ike a mee ihe ugbu a, ebe mmata anyị na mmata akara anyi ka siri ike. Mbelata mbata saịtị anyị na-ahụ ugbu a pụtara na anyị kwesịrị ịbawanye ọnụọgụgụ ka ọ chụọ nke ebe dị elu nke usoro a — iji ọdịnaya Wikimedia na mmata zuru oke nke Wikipedia — ma mụbaa ogo ntụgharị anyị nke ndị ọgụụ ka ha bụrụ ndị ọgụụ kwa mgbe, ndị editọ enwetakwara, na ndị na-enye onyinye ruo n’isi. N’afọ a, anyị ga-elekwasị anya n’ịtụ usoro ndị na-ege anyị ntị iji hụ na anyị na-eme mnwale ma na-eme ntụgharị n’ụzọ ziri ezi iji ruo ebumnuche ndị a.

Ịme ka ime ndezi dị mfe ma rụọ ọrụ nke ọma

Ngalaba otu ndị ndezi dị mma ma na-eto eto dị oke mkpa maka agamnihu Wikipedia. Iji kọwaa nke a, anyị ga-etinye uchu n’usoro nke dashboards ahaziri iche nke na-enyere ndị na-agụ akwụkwọ aka ịghọ ndị ndezi, ma kwado ndị ndezi ọhụrụ na njem ha iji bụrụ ndị ndezi na ndị nhazi nwere ahụmahụ karịa. Dashboard ndị a nwere ike inyere ndị ndezi ọhụrụ aka itolite n’ọrụ ndị ka elu, ma nyere aka gosipụta ndị ọrụ afọ ofufo nwere ahụmahụ ihe ndị chọrọ nlebara anya, dị ka mkparịta ụka ike maọbụ mmebi nwere ike ime n’ederede dị mkpa. Ebumnuche doro anya, nha mmetụta, na njikọ dị n’etiti ndị na-enye aka nwekwara ike inye aka mee ka mkpali dịkwuo elu, jigide ndị na-enye aka, nakwa nsonye ogologo oge.

Anyị ga-emepụtakwa ụzọ ọhụrụ nye ndị ndezi iji hụ mgbe nakwa otu ndị ọgụụ si etinye aka na ọdịnaya anyị. Nke a nwere ike ịgụnye ịchọpụta data a chịkọtara na ugboro ole a na-ejikọ peeji na weebụsaịtị ndị ọzọ, dị ka Google maọbụ TikTok. Ebumnuche bụ ikwe ka ndị ntinye aka họrọ itinye ihe n’ọrụ nke dabeere na nghọta nke ihe ọmụma ndị mmadụ chọrọ. (Dịka ọmụmaatụ, ọ bụrụ na ọchụchọ okwu nkịtị eduga na akụkọ na-ezighi ezi, ndị ndezi nwere ike ịmepụta ntụgharị maọbụ gbasaa ọdịnaya iji mezuo mkpa ndị ọgụụ nke ọma.)

Isokwunye ndụmọdụ sitere n’aka ndị Product and Technology Advisory Council (PTAC) anyị, anyị ga-anọgide na-elekwasị anya n’ime ka ndezi iji mkpanaka dị mfe. Dịka ọmụmaatụ, “Mmezi nhazi”, nwere ike inye aka kewaa ndozi mkpanaka ka ọ bụrụ obere ọrụ nduzi. Maka ndị ọrụ agbakwunyere ikike bụ (UWER), omume akpaaka mara mma (dịka nnyocha akwadoro maka ihe omume a na-enyo enyo) nwere ike inye aka belata ọrụ nhazi ugboro ugboro nke na-esọkarị mmụba nke ndị ọrụ ọhụrụ, na-eme ka UWER lekwasị anya n’ọrụ ndị nwere mmetụta dị elu. Anyị ga-enyekwa aka chebe akaụntụ ndị ọrụ site na nchekwa siri ike.

Nseta foto nke ederede gbasara ukwu osisi Shepherd’s Tree article na Wikipedia Bekee

Usoro ebe Ọdịdị dị mma maka ihe ọmụma

 Dịka ndị Ọrụ Wikimedia ndị ọzọ kwuru, Wikipedia na ọrụ anyị dị ka usoro dị adị nke na-agbanwe ma na-atụgharị ka oge na-aga. Ruo afọ iri abụọ gara aga, Wikipedia anọwo na-enwe “njuputa” nke mbata sitere na nchọta efu site na Google — ọtụtụ ndị ọgụụ, ndị na-enye onyinye na ndị na-enye aka. Taa, nke a na-agbanwe ma bụrụ nke ga-akwụsị n’ọdinihu. Dịka ndị ọrụ afọ ofufo Wikipedia si nwee nghọta ogologo oge (1, 2), isi ihe dị mkpa nke obodo ahụ — ndị nchịkwa na ndị ọrụ nwere ikike — anaghị abawanye na ogo achọrọ ka Wikipedia toruo maka ọgbọ ndị ga-abịa n’ihu.

Mgbe usoro osisi dị ndụ nọ n’okpuru nrụgide mmiri, ha na-emekarị ihe abụọ:

  1. Chọta ebe isi mmiri ọhụrụ dị. Ya mere, anyị na-elekwasị anya na ịgbanwe usoro mbata saịtị anyị, iji gafee ogo ebe ọ bụla e si achọta ndị mmadụ na Google.
  2.  Gbanye mgbọrọgwụ miri emi.Ya mere, anyị na-elekwasị anya n’ịkwadowanye mbawanye mmekọrịta ntinye aka– ime ka ndị ọgụ ụfọdụ Oge bụrụ ndị na-alaghachite, ma na-akwado ndị ọgụ a ka ha bụrụ ndị na-eme ndezi na ndị na-enye onyinye

Ọ bụrụ na atụmatụ afọ 2026-27 nwere ihe nnọchianya, ọ ga-abụ Shepherd’s tree, osisi a maara maka inwe mgbọrọgwụ kachasị omimi a maara n’ụwa, nke ruru omimi ruo mita iri isii na asatọ/omimi narị abụọ na iri atọ. Osisi a bụ Shepherd’s tree anaghị achụ mmiri dị n’elu. Ọ na-abanye n’ime ebe miri emi. Ma n’ime nke a, ọ na-eto nke ọma n’ime gburugburu ebe kachasị njọ n’ụwa, bụ Ọzara Kalahari.

Anyị kwenyere na Wikipedia na-eche ihe ịma aka gburugburu ebe ọrụ na-eche ihu, ọ kwesịrị inwe mgbanwe na-emụta mgbanwe a. Ọ ghaghị ịmalite ịgba mgbọrọgwụ miri emi, site n’ime ka ndị ọgụụ ụfọdụ oge bụrụ ndị ọgụụ, ndị ndezi na ndị na-enye onyinye na-anọgidesike ma na-enye aka ka oge na-aga. Ma n’ime nke a, megharịa ihe njirimara nke mewere Wikipedia, dị ka Osisi Shepherd’s tree, nke bụ isi nke ndịgide na mkpalị mmụọ n’ime ogige ịntanetị na-adịghị mma.

Can you help us translate this article?

In order for this article to reach as many people as possible we would like your help. Can you translate this article to get the message out?

Notify of
0 Comments
Inline Feedbacks
View all comments