Na-eche maka atụmatụ kwa afọ na ngalaba ngwaahịa na teknụzụ Wikimedia Foundation

A gwaram m unu niile okwu na Nọvemba gara aga banyere ihe m kwenyere bụ ajụjụ kacha dị mkpa chere otu Wikimedia ihu: kedu ka anyị ga-esi hụ na Wikipedia na ọrụ Wikimedia niile metụtara ọtụtụ ọgbọ? Ọ ga-amasị m ikele onye ọ bụla wepụtara oge iji chebara ajụjụ ahụ echiche ma zahachim, ma ugbu a enwere ohere itinye oge ịtụgharị uche na nzaghachi unu, m ga-ekwupụtakwa ihe m mụtara.

Nke mbụ, ọ dịghị otu ihe mere ndị ọrụ afọ ofufo ji enye aka. Iji zụlite ọtụtụ ọgbọ nke ndị ọrụ afọ ofufo, anyị kwesịrị ịghọta nke ọma ọtụtụ ihe mere ndị mmadụ ji etinye oge ha n’ọrụ anyị. Ọzọ, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe mere anyị ji dị iche: nkwudosike anyị ịnye ọdịnaya kwesịrị ntụkwasị obi ka mgbasa ozi na ozi na-ezighi ezi na-agbasa na ịntanetị yana ebe dịgasị iche iche na-amaaka nye nlebara anya nke ọgbọ ọhụrụ. Nke a gụnyere ịgba mbọ hụ na anyị nwetara ozi iji chịkọta ma nyefee nchikota nke ihe ọmụma mmadụ niile n’ụwa site n’ịgbasawanye ihe ọmụma anyị n’ekesasibeghi, nke nwere ike isite na ezighị ezi ihe, ịkpa ókè ma ọ bụ nke ihu abụọ. Ọdịnaya anyị kwesịrị ije ozi ma nọgide na-ịdị mkpa na ịntanetị na eme mgbanwe kwa mgbe nke ọgụgụ isi na ahụmịhe bara ụba na-akwalite. N’ikpeazụ, anyị kwesịrị ịchọta ụzọ anyị ga-esi na-akwado otu anyị site n’ịmepụta atụmatụ nkekọrịta maka ngwaahịa na ihe anyị na-enweta ka anyị nwee ike ịkwado ọrụ a ogologo oge.

A ga-egosipụta echiche ndị a na atụmatụ afọ 2024-2025 nke Wikimedia Foundation, akụkụ mbụ nke m na-ekesara unu taa n’ụdị ebumnuche edesitara maka ọrụ ngwaahịa na teknụzụ anyị. Dị ka afọ gara aga. , atụmatụ anyị niile kwa afọ ga-adabere na mkpa teknụzụ nke ndị na-ege anyị nti na nhiwe, anyị ga-achọkwa nzaghachi gị iji mara ma anyị na-elekwasị anya na nsogbu ndị ziri ezi. Ebumnobi ndị a ga-enyeaka chịkọta echiche anyị na-enweta n’aka ndị ngalaba otu n’ime ọnwa ole na ole gara aga site na Talking:2024, na ndepụta nzipu ozi na ibe okwu, yana na ọgbakọ otu nwere gbasara atụmatụ ngwaahịa na teknụzụ anyị maka afọ na-abịa. . Ị nwere ike ịhụ ndesịta ebumnobi n’uju na Meta-Wiki.

“Ebumnobi” bụ ntụziaka dị elu nke ga-achịkọba ngwaahịa na ọrụ nkà na ụzụ anyị na-eme maka afọ mmefu ego na-esote. A kpachara anya mee ha asaa asa, na-anọchi anya ntụzịaka nke atụmatụ anyị yana, nke kacha mkpa, ihe ịma aka ndị anyị na-atụ aro ga-ebute ụzọ n’etiti ọtụtụ nrụaka a ga-elekwasị anya maka afọ na-abịa abịa. Anyị na-ekesarịta nke a ugbu a ka ndị otu ngalaba nwee ike inye aka n’ịchịkọba echiche mmalite anyị yana tupu etinye mgbakọ mmefu ego na ebumnuche ndị atụọrala maka afọ.

Nzahachị

Otu mpaghara anyị ga-atụkaarị anya nzaghachi bụ ọrụ anyị nke achịkọtara n’okpuru aha akpọrọ “ahụmahụ Wiki.” “ahụmahụ Wiki” bụ maka otu anyị si ewepụta nke ọma, imelite, na imeputa ka ndị mmadụ si eji wiki eme ihe kpomkwem, ma ọ bụladị dịka ndị ntinye aka, ndị ahịa, ma ọ bụ ndị nyere onyinye. Nke a gụnyere ọrụ iji kwado isi teknụzụ na mmataara anyị yana igba mbọ hụ na anyị nwere ike imeziwanye ahụmịhe nke ndị ndezi afọ ofufo – ọkachasị, ndị ndezi nwere ikike – site na njirimara na ngwa ọrụ ka mma, ọrụ ntụgharị asụsụ na nkwalite ikpo okwu.

Nke a bụ ụfọdụ ntụgharị uche sitere na mkparịta ụka atụmatụ anyị na nso nso a, yana ajụjụ ụfọdụ nye unu niile iji nyere anyị aka imepụta echiche anyị:

  1. Ịnyeaka afọ ofufu na oru Wikimedia kwesịrị inwe ihe na-agba ume. Anyị na-echekwa na ahụmahụ nke imekọ ihe n’ịntanetị kwesịrị ịbụ akụkụ bụ isi nke ihe na-eme ka ndị ọrụ afọ ofufo lọghachi. Kedu ihe ọ na-ewe ka ndị ọrụ afọ ofufo hụta ndezi dịka ihe bara uru, na ịrụkọ ọrụ nke ọma iji wuo ọdịnaya kwesịrị ntụkwasị obi?
  2. Ntụkwasị obi nke ọdịnaya anyị bụ akụkụ nke ntunye pụrụ iche nke Wikimedia nyere ụwa, yana ihe na-eme ka ndị mmadụ na-abịa n’elu ihe anyị na iji ọdịnaya anyị mee ihe. Kedu ihe anyị nwere ike wulite nke ga-enyere aka bawanye ọdịnaya kwesịrị ntụkwasị obi ngwa ngwa, mana nke ka nọ n’ọnọdụ nchekwa dị mma nke otu ngalaba setịpụrụ na ọrụ ọ bụla?
  3. iji nọgide na-adị mkpa mana amaaka na nnukwu nhiwe ịntanetị ndị ọzọ, Wikimedia chọrọ ọgbọ ọhụrụ nke ndị na-azụ ahịa ka ha nwee mmetụta nke njikọ na ọdịnaya anyị. Kedu ka anyị ga-esi mee ka ọdịnaya anyị dị mfe ịchọpụta na imekọrịta ihe maka ndị na-agụ na ndị na-enye onyinye?
  4. N’ime afọ ebe mmegbu ịntanetị na-arị elụ, anyị kwesịrị ịgba mbọ hụ na echekwabara otu anyị, ọgbakọ na sistemụ ozi. Anyị na-echekwa ọrụ nnabata na-agbanwe agbanwe, ebe ndị omebe iwu zuru ụwa ọnụ na-ele anya ịkpụzi nzochi, njirimara, na ịkekọrịta ozi n’ịntanetị. Kedu mmelite nke ikike ịlụ ọgụ mmegbu ga-enyere anyị aka imeri nsogbu ndị a?
  5. MediaWiki, ọgbakọ sọftụwia na oghere na-enye ohere ka Wikipedia rụọ ọrụ, chọrọ nkwado na-aga n’ihu n’ime afọ iri na-abịanụ iji nye ihe okike, nchịkọba, nchekwa, nchọpụta, na ojiji nke, ọtụtụ ọdịnaya efu nke ọtụtụ asụsụ. Kedu mkpebi na nkwalite ọgbakọ anyị nwere ike ime n’afọ a iji hụ na MediaWiki na-adigide?.