O nwetụla mgbe ị chọrọ ka ngwá ọrụ ma ọ bụ atụmatụ ọhụrụ ga-eme ka ime ndezi dị mfe na wiki? Iji mee ka ọrụ Wikimedia wee too ma na-eme nke ọma, ndị ọrụ afọ ofufo kwesiri inwe ngwanrọ na-enyere ha aka ide, ịkọ, bulite, na ijikọ aka ọnụ n’ụzọ dị mfe nakwa n’ofe asụsụ. Ndị otu ngwaahịa na Wikimedia Foundation na-ewulite ma na-edobe sọftụwia n’ime afọ niile, ma chọọ mmekorita ya na ndị ọrụ afọ ofufo iji wuo, nwalee na wepụta nkwalite. Iji kwado njikọ aka a, Foundation emepegharịala ugbu a otu n’ime ọwa mbụ anyị maka ntụpụta aro na echiche teknụzụ: nke Ndepụta ọchịchọ ngalaba .
Ndepụta ọchịchọ ngalaba otu bụ ọgbakọ Wikimedia maka ndị ọrụ afọ ofufo ịkekọrịta echiche (a na-akpọ ọchịchọ) iji melite ka wiki si arụ ọrụ. N’adịghị ka ntugharị gara aga, ndepụta ọchịchọ na-enye ohere ndebanye mgbe niile, ndị ọrụ afọ ofufo nwere ike debanye ọchịchọ n’asụsụ ọ bụla. Ọchịchọ kwesịrị igosipụta ihe ịma aka ngwaahịa ma ọ bụ teknụzụ nke ndị ọrụ afọ ofufo na-enweta, ma nye ohere nye ndị mmepe, ndị na-emepụta ihe na ndị injinia ka ha na ndị oji ya eme ihe jikọọ aka iji nweta ngwọta nsogbu . Ozugbo ndebanye ọchịchọ batara, ndị otu Wikimedia Foundation, ndị mmepe afọ ofufo, na ndị mmekọ Wikimedia ga-enyocha ọchịchọ ka ohere ojijin’efu wee họrọ mpaghara ha ga-ewulite na ya.
Ndị ọrụ afọ ofufo nwere ike itinye aka na ndepụta ọchịchọ ngalaba otu na ọkwa atọ: zibanye, votuo, na wuo.
- Zibanye ọchịchọ: Ndepụta Ọchịchọ ngalaba ọhụrụ na-enyere ndị ọrụ afọ ofufo aka ịzibanye ọchịchọ ha na wikitext ma ọ na Visual Editor, nakwa iji asụsụ masịrị ha. Ndị ọrụ afọ ofufo nwekwara ike izibanye ọtụtụ ọchịchọ dịka ha chọrọ, n’oge ọ bụla, mana ha ga-abanyerịrị na MetaWiki. Nke a bụ otu esi amalite:
- Gaa na ibe ebe Ndepụta ọchịchọ ngalaba wee pịa ” Zibanye ọchịchọ,” ma mezue ihe ndị a chọrọ
- Aha: aha maka ọchịchọ gị.
- Nkọwa: nsogbu ịchọrọ idozi.
- Ụdị: arịrịọ atụmatụ, mkpesa bog, mgbanwe sistemụ, ma ọ bụ ihe ọzọ.
- Ọrụ: Ọrụ Wiki metụtara ọchịchọ ahụ.
- Ndị ọrụ ometụtara: Nkọwa nke ndị ọrụ ga-erite uru ma edozie ọchịchọ ahụ.
- Ndị ọrụ nwere ike ịkekọrịta tiketi Phabricator ma ha chọọ.
- Pịa Zibanye. Ọ bụ ya!
- Votuo na mpaghara elekwasịrị anya: Ndị otu Wikimedia Foundation ga-enyocha ọchịchọ ọhụrụ dabere na mkpa na mmecha na, ọ bụrụ na ọdabara, achịkọta ya na mpaghara elekwasịri anya, nke na-anọchite anya nchikọba ọchịchọ nwere otu nsogbu ahụ. Foundation ga emepụta mpaghara nlekwasị anya, ndị ọrụ afọ ofufo nwere ike ịtụ vootu ma nye ntunye okwu na mpaghara nlekwasị anya iji gosi ohere dị mkpa aga ebute ụzọ.
Ndị otu Wikimedia Foundation ga-anakwere Mpaghara nlebara anya dịka akụkụ nke atụmatụ Kwa afọ. Nke a bụ mgbanwe dị mkpa site na ndepụta achọrọ gara aga, ebe ọtụtụ ndị otu Foundation na-arụ ọrụ iji mezuo ọchịchọ ngalaba (lee: Dark mode, nlele ndezi), emebeghị nke a mgbe niile nakwa n’ogo. N’ịga n’ihu, ndepụta ọchịchọ ngalaba ga-arụ ọrụ dị ka usoro etiti maka ị nweta mkpa nka ngalaba otu n’ime atụmatụ ngwaahịa & Teknụzụ kwa afọ, nke bụ otu esi eme mkpebi nrụpụta ihe dị mkpa. Malite na 2024-5, Foundation etinyela ma ọ dịkarịa ala otu abụọ (Community Tech and Moderator tooling) iji nyochaa Ndepụta Ọchịchọ, ịnabata, na imezi Mpaghara nlekwasị anya. Ka anyị na-enyocha nzaghachi ngalaba na Mpaghara Nlekwasị anya, otu ndị ọzọ nwekwara ike ịnakwere Mpaghara Nlebara anya maka afọ a. Site na 2025-2026, anyị na-atụ anya ọbụna ọchịchọ ndị ọzọ ibanye na atmatụ kwa afọ, na nkwenye na ọ bụghị ọchịchọ ọ bụla ka a ga-etinye na mpaghara nlekwasịanya, na ọ bụghị ọchịchọ ọ bụla ma ọ bụ Mpaghara nlekwasị anya ọbụla ka Foundation ga-etinye n’ọrụ.
Anyị ga na-ewebata ngalaba mgbado anya mbụ anyị na Wikimania, ma kpọọ ndị ọrụ afọ ofufo ka ha na anyị rụkọọ ọrụ na Mpaghara nlekwasị anya n’ọdịnihu.
- Wuo usoro ngwọta teknụzụ. Foundation, ndị mmekọ, na ndị na-ahụ maka ọrụ aka nwere ike ịnakwere Mpaghara Nlebara anya ma gaa n’ihu na-arụkọ ọrụ ha na ndị na-enye aka nkwalite na nwulite echiche ọhụrụ.
Ndepụta ọchịchọ ngalaba dị mkpa iji wulite Njem ọtụtụ ọgbọ; iji wuo ngwanrọ ga-adigide, anyị kwesịrị ịnụ , na imekọ ihe ọnụ nke anyị na ndị ọrụ afọ ofufo gbasara ihe ịma aka na ohere iji melite ngwaahịa na teknụzụ anyị. Onye ọ bụla nọ na Njem a nwere ike itinye aka na Ọchịchọ, ma soro ndị ọrụ afọ ofufo ibe ya na Wikimedia Foundation rụkọọ ọrụ iji wuo ngwanrọ ka mma.
Obi dị anyị ụtọ na anyị na gị ga-emepeghachi ndepụta ọchịchọ ngalaba, na anyị n’atụ anya ịhụ nsogbu na ohere ị nwere ịkesara ibe gị.
Can you help us translate this article?
In order for this article to reach as many people as possible we would like your help. Can you translate this article to get the message out?
Start translation