Abstract Wikipedia enwetala nkwado ọhụrụ n’aka Rockefeller Foundation

Wikimedia Foundation ji obi ụtọ na-akọ na Rockefeller Foundation enyela onyinye $1,000,000 (nde dollar) iji kwado mmepe nke Abstract Wikipedia, atụmatụ nke ga-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ nwee ike ịkesakwu ihe ọmụma n’asụsụ dị iche iche n’ofe Wikipedia, na-eme ka ebumnuche Ịha nhatanha nke Wikimedia na-aga n’ihu.

Ebumnuche ogologo oge nke Abstract Wikipedia bụ iwulite ntọala ọmụma nke na-adabereghị na asụsụ, na-eme ka ọ dịrị ndị ndezi Wikipedia mfe ịkekọrịta, tinye, tụgharịa, na melite ihe ọmụma n’ofe asụsụ na akwụkwọ nkà ihe ọmụma dị n’ịntanetị. Na nkenke, atụmatụ a ga-enyere ọtụtụ ndị mmadụ aka itinye ọdịnaya n’asụsụ masịrị ha, na-eme ka ndị na-ege ntị buru ibu na ndị zuru ụwa ọnụ nweta ihe ọmụma ahụ.

Onyinye sitere n’aka Rockefeller Foundation ga-enyekwa ndị otu Abstract Wikipedia aka ịkwalite Wikifunctions, akụrụngwa teknụzụ dị n’azụ echiche nke Abstract Wikipedia. Wikifunctions ga-enye ndị ọrụ omenobiọma ike ịmepụta koodu nwere ike ịmegharị nke nwere ike ịrụ ọrụ ụfọdụ, dị ka ịmepụta ederede n’asụsụ ụfọdụ.

“Anyị n’enye Rockefeller Foundation ekele maka nkwado mmesapụ aka ya maka ebumnuche Wikimedia Foundation iji hụ na onye ọ bụla nọ n’ụwa nwere ohere inweta ihe ọmụma n’efu na nha nha,” Denny Vrandečić, Onye isi nke Ọrụ Pụrụ Iche na Wikimedia Foundation kwuru. “Ọrụ a ga-enyere asụsụ dị iche iche nke ndị ọrụ omenobiọma Wikipedia aka ịrụkọ ọrụ ọnụ site na ịkekọrịta koodu na ọdịnaya mgbe ha na-ede akụkọ Wikipedia, n’agbanyeghị ma ha na-asụ otu asụsụ.”

Rockefeller Foundation bụ obu ụzọ n’enyemaka eguzobere na mmekorita ọnụ na oke sayensị, teknụzụ, na ihe ọhụrụ nke na-enyere ndị mmadụ n’otu n’otu, ezinụlọ na obodo aka ito eto. Ihe ha lekwasịrị anya bụ ịkwalite ume ọhụrụ maka mmadụ niile, na-akpali mkpagharị akụ na ụba, na ịhụ na ịnweta nlekọta ahụike na nri na-edozi ahụ ziri ezi. Nkwado ha nke Abstract Wikipedia dabara na ebumnuche Rockefeller Foundation nke ịbawanye ohere inweta ihe ọmụma na ozi a pụrụ ịdabere na ya.

“Anyị nwere obi ụtọ ịkwado Wikimedia Foundation na ọtụtụ ndi otu Wikimedia zuru uwa ọnụ na mbọ ya ịmepụta Abstract Wikipedia, nke nwere ikike ịgbanwe ụzọ anyị si eche echiche na ịkekọrịta ihe ọmụma,” Zia Khan, onye isi osote onye isi oche nke Ihe Ọhụrụ kwuru na Ụlọ ọrụ Rockefeller Foundation. “Site n’ịmepụta ọdịnaya sitere na data ahaziri ahazi, Wikipedia Abstract nwere ike ime ka ihe ọmụma dịkwuo mfe na nsonye karịa mgbe ọ bụla. Anyị nwere obi ụtọ na anyị so na nke a n’atụkwanụ anya mmetụta ya n’afọ ndi na-abia abia.

Wikimedia Foundation nọgidesiri ike na mkpata ego ga-adịgide maka ọdịnihu. Onyinye nwere ebumnuche bụ otu ụzọ anyị ga-esi soro otu ndị ọzọ na-ekerịta ebumnuche anyị ma chọọ ịkwado ọhụụ nke Wikimedia Foundation na mmegharị ihe ọmụma n’efu. Ọrụ Abstract Wikipedia nke iji gboo oghere ihe ọmụma na ịbawanye nnweta nke mmụta n’ọtụtụ asụsụ nwere njikọ chiri anya na ebumnuche ntụzịaka 2030 nke mmegharị ahụ nke Ịha nhatanha na Ọmụma dịka Ọrụ.

Gbasara Abstract Wikipedia
Ị chọrọ ịmatakwu gbasara Abstract Wikipedia? Nweta mgbasa ozi oge niile ma mụtakwa ka gị na ndị otu anyị ga-esi rụọ ọrụ na usoro ọzọ na Meta-Wiki.