Mmelite ozi ndị na-ege ntị n’ọdịnihu: Nghọta sitere na nnyocha ngwa mmekọrịta na ChatGPT yana ihe anyị na-amụta gbasara ndị ọgụụ n’ọdịnihu

The Soyuz TMA-14M spacecraft is seen as it lands with Expedition 42 commander Barry Wilmore of NASA, Alexander Samokutyaev of the Russian Federal Space Agency (Roscosmos) and Elena Serova of Roscosmos near the town of Zhezkazgan, Kazakhstan on Thursday, March 12, 2015. NASA Astronaut Wilmore, Russian Cosmonauts Samokutyaev and Serova are returning after almost six months onboard the International Space Station where they served as members of the Expedition 41 and 42 crews. Photo Credit: (NASA/Bill Ingalls)
Image: NASA/Bill Ingalls, public domain.

Na Julaị nke afọ gara aga, anyị kwupụtara “Ndị na-ege ntị n’ọdịnihu,” atụmatụ ọhụrụ nke Wikimedia Foundation iji chọpụta otú anyị nwere ike isi na-egbo mkpa nke ndị na-achọ ihe ọmụma na ndị na-ekesa ihe ọmụma maka ọgbọ ndị ka na-abịa. Mbipute a bụ mmelite etiti afọ maka ihe anyị mụtara site na nnwale ruo taa na nke na-esote anyị lekwasịrị anya.

Kedu ka ọgbọ ndị na-abịa n’ihu ga-esi mụta ma tinye aka na Wikipedia? Anyị amabeghị – mana site na nyocha ngwa ngwa emere n’ime afọ gara aga, Wikimedia Foundation achịkọtala nghọta miri emi banyere otu Wikipedia ga-esi gaa n’ihu na-egbo mkpa nke ndị na-achọ ihe ọmụma na ndị na-ekesa ihe ọmụma maka ọgbọ ndị ka na-abịa, ọbụlagodi dịka teknụzụ na omume onye ọrụ n’ịntanetị na-aga n’ihu na-eto. Gụkwuo maka ihe anyị mụtaworo site na nnwale nke mbụ anyị (inyocha ChatGPT na ngwa mmekọrịta), yana nnwale ọhụrụ na nyocha ederede ịntanetị anyị na-eme atụmatụ a dabere na mmụta ndị a.

Ihe ncheta: Gịnị bụ “Ndị na-ege ntị n’ọdịnihu”?

Ebumnuche nke Njem Wikimedia bụ rịị iwetara onye ọ bụla nọ n’ụwa ihe ọmụma n’efu. Agbanyeghị, anyị maara na nkwalite teknụzụ nke oge na-adịbeghị anya – dị ka ọganihu n’ọgụgụ isi nke abụghị nke mmadụ, ngwa mmekọrịta ọhụrụ, na ngwaọrụ ndị na-enye anyị ohere isoro ụwa dijitalụ na-emekọrịta ihe n’ụzọ ọhụrụ dị iche iche- nwere ikike ịchịkọba ọrụ nke ọrụ Wikimedia n’ime nnukwu ebe ozi gburugburu. Ọ bụ ezie na ozi anyị ka dị ka mgbe Wikipedia malitere n’ihe karịrị afọ iri abụọ gara aga, ụzọ iji mezuo ya ga-adị mkpa iji gaa n’ihu na-etolite.

Iji mee nke a, n’afọ gara aga, Wikimedia Foundation kepụtara usoro ọrụ ọhụrụ a na-akpọ “Ndị na-ege ntị n’ọdịnihu,” mmekorita nke otu dị iche iche iji chọpụta otú anyị nwere ike isi ziruo ndị na-ege ntị n’ọdịnihu nke ndị na-achọ ihe ọmụma na ndị ntinye aka.

Ndị na-ege ntị n’ọdịnihu anaghị ewupụta ngwaahịa – ọ na-ebupụta nnwale oge akara aka iji chọpụta na ịkwado ohere maka Wikimedia Foundation imepụta ihe ọhụrụ. Ọ bụrụ na nnwale wepụta nsonaazụ nyere olileanya, ọ nwere ike ime Wikimedia Foundation itinye nnukwu ego na ngwaahịa ọhụrụ na/ma ọ bụ ụzọ iji ruo ndị na-ege ntị ọhụrụ; ọ bụrụ na ọ bụghị (dị ka ọ dị na nnwale mbụ anyị, ngwa mgbakwunye Wikipedia maka ChatGPT – ihe ọzọ gbasara nke a nọ n’okpuru), anyị ka ga-enweta nghọta bara uru, dị ngwa ngwa na enweghị mmetụta dị ukwuu na akụrụngwa anyị.

Kedu ihe nyocha anyị mechaarala na ihe anyị mụtara ruo taa?

Screenshot of the experimental Wikipedia plugin for ChatGPT, tested in July 2023–January 2024.

1. AI Mkparịtaụka : Ọ Karịrị ịbụ naanị chatbot

Anyị malitere afọ ahụ na ajụjụ nyocha ndị a gbasara mmepe na AI mkparịtaụka :

  1. Ndị na-achọ ihe ọmụma n’ịntanetị a ga-agbanwe na ịnweta ozi site na Wikipedia kama gawa ChatGPT?
  2. Kedu ka AI mkparịtaụka si eme nke ọma n’ịchọta na ichikota ozi sitere na Wikipedia?

Nnwale mbụ anyị mere n’afọ bụ ịmepụta ngwa mgbakwunye Wikipedia maka ChatGPT, nke nyere ndị ojiji ChatGPT ohere ịnweta azịza nye ajụjụ ọmụma zuru oke kpọmkwem sitere na Wikipedia (kama karịa data izugbe nke a zụrụ bot na ya). Nchọpụta sitere na nnwale a nyeere anyị aka ịmụta:

  1. ChatGPT abụghị Wikipedia ọhụrụ – Wikipedia ka bụ isi mmalite ozi dị mkpa enwere ike ịtụkwasị obi n’ịntanetị. Site na traffik data gaa na Wikipedia n’ime afọ, yana ojiji na data nyocha si na ngwa mgbakwunye ChatGPT nnwale anyị, anyị chịkọbara na ọ bụrụgodị na ndị ahịa na-amalite iji AI chatbot dị ka ChatGPT maka ozi, ọ dị ka ọ ga-abụ na mgbakwunye na, ma ọ bụghị kama Wikipedia. Ndị ojiji ngwa mgbakwunye anyị kwuru na ha ka gara na Wikipedia wee kwupụta na mgbe ha matara ozi ha na-enweta na ChatGPT sitere na Wikipedia, ha na-atụkwasịkwu ya obi.
  2. AI Mkparịtaụka nwere ike ịchọta ma chịkọta ọdịnaya Wikipedia n’ụzọ ziri ezi (n’agbanyeghị na ọ zuchaghị oke). Ọ dị ka ndị mmadụ (n’ụzọ kwere nghọta) na-akpachapụ anya inweta ozi sitere na chatbot ọgụgụ isi abụghị nke mmadụ dị ka ChatGPT, usoro anyị ji mepụta ngwa mgbakwunye nnwale anyị (ya bụ: iji AI gbakwunye iji ọgụgụ isi chọta ozi dị mkpa na ebe ihe ọmụma akọwapụtara dị ka Wikipedia ma weghachi nchịkọta nye onye ojiji, usoro a maara dị ka retrieval-augmented generation or RAG) nyere ezigbo ịdị mma dị elu, n’agbanyeghị na ọ nweghị ụzọ mmepụta zuru oke.

Nke a na-edu anyị ikwubi na generative AI nwere ike inwe ọrụ dị mkpa ọ ga-arụ n’inyere ndị na-ege ntị n’ọdịnihu aka nwogharịa ihe ọmụma Wikipedia nke ọma, ma chatbot abụghị nanị ụzọ kachasị mma iji mezuo nke a. Nchọpụta ndị a dugakwara anyị na nnwale AI ọhụrụ, Nrụaka Edensibịa (edere karịa nke a na nke dị n’okpuru).

2. Ngwa ọhaneze mmadụ na-akwalite: oghere oke bekee wiki ọhụrụ?

Wikipedian Annie Rauwerda, who started a viral TikTok series on Perpetual stew, meets with a Bangkok stew-maker. Image: Annierau, CC BY-SA 4.0.

Agbanyeghị na 2023 bụ afọ ChatGPT, anyị chọpụtara usoro ọzọ dị mkpa na annual External Trends report nke afọ gara aga: ndị n’ege ntị na-eto eto na-enwewanye mmasị ịchọ ozi na-a bụghị na webụ ma ọ bụ Wikipedia, kama na ngwa mmekọrịta mmadụ na-akwalite dịka TikTok na YouTube. Nghọta a dugara anyị n’ajụjụ nyocha ndị a:

  1. Ịmegharị ọdịnaya Wikipedia ka ọ bụrụ ụdị ngwa ọhaneze mmadụ na-akwalite o nwere ike ime ka ozi na-atọ ndị na-eto eto ụtọ karịa?
  2. Enwere ndị na-emepụta ọdịnaya na ngwa ndị a na-eche banyere ikesa ozi a pụrụ ịdabere na ya na ọdịnaya sitere na ọrụ Wikimedia?

Site na nyocha qualitative (nyocha, ajụjụ ọnụ na ọmụmụ ojiji ihe eji eme ihe nke ndị na-azụ ahịa na ndị okike), anyị mụtara ihe ndị a:

Ebee ka anyị Lekwasara anya ọzọ?

Nnwale ọhụrụ: “Achọrọ ntinye edensibịa”

Ka oghere dijitalụ na-arịwanye elu n’ihe ize ndụ nke ịbụ ebe ozi ndughe na-ejupụta, anyị na-enyocha ma enwere ike iji AI nweta ihe ọmụma Wikipedia iji nyere ndị na ọgụụ aka ịghọta ntụkwasị obi nke ozi ha na-enweta n’ịntanetị.

Ntụtuaka ntinye edensidee bụ nnwale ọhụrụ nke ebumnobi ya bụ ime nke a. Site na mgbatị nnwale maka ihe nchọgharị weebụ Chrome, nke na-eji nrụ ọrụ Model Large Language (LLM) dị elu, ndị ojiji ga-enwe ike iji ngwa ngwa tulee ihe ha na-agụ n’ịntanetị na ọdịnaya Wikipedia. Mgbatị ahụ ga-ewetara ndị ojiji ozi gbasara ma akwadoro nkwupụta ahọpụtara ma ọ bụ na akwadoghị ya site na ozi dị na Wikipedia, tinyere ọnụọgụ edensidee ndị ejiri na edemede Wikipedia o metụtara, ọnụọgụ ndị nnyere aka rụgoro ọrụ na ya, yana ụbọchị edeziri ya ikpeazụ. . Dị ka ọ dị na nnwale mbụ generative AI anyị, anyị ga-ejikwa nlezianya na-enyocha etu AI si eme nke ọma n’ịchọ na ichikota ozi sitere na Wikipedia n’ime ngwa a. N’ime ọnwa ole na ole sochirinụ, Ntụaka ntinye Edensidee ga-adị maka ndị ojiji nwere mmasị ịnwale ya, anyị ga na-enyocha ojiji na nzaghachi ndị ojiji.

Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu gbasara ma nyere aka nwalee Ntụaka ntinye Edensidee achọrọ, biko gaa na ibe ọrụ na Meta-Wiki maka nkọwa ndị ọzọ..

Notify of
0 Comments
Inline Feedbacks
View all comments