Mmeri Wiki Mentor Africa nwetara na Hackathon mbụ n’ịntanetị

Translate this post

N’ime oge dijitalụ nke juputara na ohere, Wiki Mentor Africa nọ dị ka ebe nlekwasị anya nke olileanya na ohere. N’ịbụ nke ewepụtara dị ka nkwado iji gbochie oghere enweghị mmụtara nka, Wiki Mentor Africa bụ mmemme nchepụta nkuzi emebere iji jikọọ ndị nnyere aka nka na ụzụ Wikimedia na ndị bịara ọhụrụ si na gburugburu kọntinent Afrika ndị nwere mmasị inye aka na ebe nka nke Wikimedia. Mmemme nchepụta pụrụ iche a gbadoro ụkwụ n’ịkwa ụzọ nye ọtụtụ ndị Afrịka ịbanye na teknụzụ Wikimedia site n’usoro nkuzi, ohere imepụta ihe ọhụrụ, imekọ ihe ọnụ, na inye nkwado dijitalụ.

N’ịnyekarị nkwado nye ndị Africa chọrọ ka ha bụrụ ndị nrụpụta ngwa Wikimedia/ndị na-emepụta ngwá ọrụ na ndị na-ede akara teknụzụ, Wiki Mentor Africa na-arụ ọrụ dị mkpa n’ịkwalite ọgbakọ ebe a na-ekekọrịta ihe ọmụma, nkà, na mmụtaara n’efu, na-akwado ọgbọ ọhụrụ nke ndị nnyere aka na nkà na ụzụ . Site n’ọnwa Jenụwarị abalị iri na itoolu ruo ụbọchị iri abụọ na otu, nhiwe a nwetara ume ọhụrụ site na Hackathon Wiki Mentor Africa nke izizi emeruru otu narị pacentị n’ịntanentị, yana nleba anya na ngwa ISA ọhụrụ.

Chee maka nke a: Ogbakọ ịntanetị jupụtara na ịtụ anya, ebe ihe dị ka mmadụ Narị atọ na iri abụọ nwere otu mmasị si gburugburu kọntinent a gbakọbara, ọ bụghị naanị n’inweta mmụta kama imekwa mgbanwe. Zoom na Telegram ghọrọ ogige dijitalụ anyị, nke na-egosi na itinye obi gị n’ime Ihe, ị ga-enwe mmụta usoro ịga esi mee ya ma nwee ihe ịga nke ọmma na ya, – ọ bụladị na nsogbu ọkụ na ihe ịma aka ịntanetị a na-enwe na Africa. Mkpebi ịkwado ọtụtụ asụsụ, gụnyere French, nyeereaka kwado nsonye pụtara ihe na Hackathon a, nke gbara mbọ hụ na-anụrụ ma nabata olu na echiche dị iche iche. Ọzọkwa, site n’ihiwe ihe omume ahụ n’ịntanetị, Wiki Mentor Africa wezugara ihe mgbochi nsonye n’ihi mpaghara, na-enye onye ọ bụla, nọ ebe ọ bụla, ohere isonye ma mee ntunye. Site na nhụta nke Wiki Mentor Africa, ihe omume a karịrị i bụ hackathon; Ọ bụ mmalite nzọ ụkwụ lekwasịrị anya iwu na ịnye nkwudosike nye ngalaba Otu nke nsonye ndị Wikimedia nwere nka tebknụzụ gburugburu Africa.

Ngosipúta Ngwá Ọrụ ISA

Ngwá ọrụ ISA bu otu n’ime isi ahụrụ kwawa okpu na Hackathon anyị, ngwa ọtụtụ asụsụ, nke nyere ohere mbụ nke ojiji na ekwenti mkpanaaka e mere iji mee ka usoro ime ka Wikimedia Commons dịkwuo mfe. ISA na-enyere ndị ọrụ aka ịme “ obere ntunye” – dị ka nkọwa, obere nkọwa, tag, na ihe ndị ọzọ – nye ihe onyogo ndị ngalaba Òtù Wikimedia dị uchu dị iche iche tinyere. Ngwá ọrụ a abụghị naanị nke na-akwado mmekọrịta miri emi nke ọdịnaya dị na Wikimedia Commons mana ọ na-arụkwa ọrụ dị oke mkpa n’ime ka ebe nchekwa ahụ dị mfe ojiji ma nwee ohere ihe ọmụma nye ndị mmadụ gburugburu ụwa. Kpọmkwem, maka ndị ntinye aka na Africa, ngwá ọrụ ISA nwere uru dị ukwuu dịka a na-eji ya eme ihe n’oge mgbasa ozi Wiki Loves Africa, nke ana arụ ụka bụ asọmpi foto kacha ukwuu na kọntinent ahụ, si otú ahụ na-eme ka ngosipúta na njupụta nke ihe nketa Africa dịkwuo elu

Ọchịchọ na Mmeri

Ọchịchọ anyị tụrụ anya dị abụọ: Iwebata ndị na-amaghị ihe na ihe ịtụnanya nke mpaghara teknụzụ Wikimedia na ịchịkọta ndị ọrụ gburugburu ngwa ISA, na-enye ndụ ọhụrụ nye koodu ya. Ọkpụkpọ Oku ime ihe omume a nwere nzaghachi dị egwu – mmadụ Narị anọ na iri abụọ na asatọ debanyere aha, na-achọsi ike ịbanye na nsonye ime ntunye dijitalụ, yana ndị nsonye mmadụ Narị atọ na iri abụọ na asatọ gbalịsiri ike n’isonye na nnọkọ Zoom ọ bụla.

Ma gịnị bụ ọchịchọ na-enweghị ihe ịma aka n’ihu ya? Nke anyị bịara n’ụdị ịntanetị dị oke ọnụ yana nsogbu ọkụ . N’agbanyeghị nke ahụ, na nsogbu ndị a, hackathon abụghị naanị ihe gara nke ọma; ọ bụ emume nkwudosike na ịdị n’otu.

Akụkọ oge dị ịtụnanya na Ihe nnweta dị elu

N’ime oke koodu na nwanne ya nwoke (na nwanne nwanyị 😊), anyị hiwere ngalaba òtù gburugburu ngwa ISA. Nke a abụghị naanị maka idozi bọg; ọ bụ maka inweta ihe nketa. A rụrụ ihe karịrị tiketi Phabricator iri abụọ, gụnyere ụfọdụ kpalitere nhụta maka ojiji akụrụngwa na mmemme dị mkpa dị ka mkpọsa Wiki Loves Africa. E gbukweere ya ọdụ; ma nwee mmeri n’ikpeazụ. 

Agbanyeghị nnweta ihe ịga nke ọma teknụzụ enwetara , nguzobe nke ihe karịrị ndị otu iri na atọ, nke nke ọ bụla na-ewere otu tiketi Phabricator ma ọ bụ karịa, bụ ihe akaebe na-egosi mmụọ imekọ ihe ọnụ anyị. Otu ndị a, site n’ijikọ aka gboo ihe ịma aka chere ha ịhụ ọnụ, ọ bụghị naanị idozi nsogbu – ma ha na emeko usoro mkpakọrịta na ntinye uchu nke gosipụtara uru ngalaba Òtù bara. Ebe a a na-ejikọ aka ọnụ, ebe ndị otu na-arụkọ ọrụ iji nweta otu ebumnobi , gosịpụtara dị ka ihe akaebe doro anya na e hiwere ọgbakọ na-akwadosi ihe ọmụma ike n’oge hackathon a.

Ọdịiche dị iche iche nke ndị nkuzi anyị bụ akụkọ n’onwe ya – ndị nsonye sitere na mba iri na anọ dị iche iche, ebe ọtụtụ sonyere n’ọgbọ emume hackathon nke mbụ ha. Nzụlite ha dị iche iche dị ka ọdịdị ala Africa, ma ha nwere otu ebumnuche dị ka: ịmụta, ime ntunye, na ime mgbanwe.

Ndi Mmeri Zoro ezo

Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a gaara ekwe omume ma ọ bụrụ na nkwado siri ike nke ndị nkwado anyị, bụ ndị mmesapụ aka ha mere ka anyị nwee ihe ịga nke ọma Ekele sitere n’obim kam na-enye otu ndị ọrụ Igbo Wikimedia User group , Wikimedia Deutschland, Wiki In Africa, na Wikimedia Foundation maka ikwere na ike imekọ ihe ọnụ na nkwa nke Africa dijitalụ mepere emepe.

Ndị otu nhazi, cadre nke ndị dike chịkọbara nka ana-apụghị ịkọwa, okirikiri mmachi nke uche na igwe na-enweghị nraranye na nkà. Ha gbara mbọ hụ na onye ọ bụla so na ya, onye ndụmọdụ, ma onye na-ekiri ihe nkiri bụ akụkụ nke ihe anwansi n’ezie.

Oleekwa ebe anyị ga-anọ na-enweghị ndị na-enye mkpali? Ndị ndụmọdụ bụ ndị ji amamihe na ndidi duzie, na ndị sonyere na nghọta ha na ọgụgụ isi ha na-enwu gosịpụtara. Ngosipụta pụrụiche na-abịara ndị ndụmọdụ anyị: Eugene Egbe, Amir Aharoni, Florence Devouard, na Fongoh Tayong, ndị ntunye ha abụghị naanị ihe kwesịrị ịrịba ama kama nke n’eweta mgbanwe.

Ihe na-eso na ebe nlekwasị anya

Wiki Mentor Africa Hackathon 2024 bụ karịa ihe omume; ọ bụ ihe mgbama, na-atuzi ụzọ nye ndị nkuzi na ndị na-amụ́ amụ́ n’ọdịnihu na-achọ ịchọpụta oke ngalaba nka Wikimedia. Nzukọ a gosipụtara na na njikọ aka ọnụ, anyị nwere ike imeri ihe mgbochi nnweta na nsonye, ncheputa ihe ọhụrụ na ọrụ dị mkpa na kọntinent anyị, ma tọọ ntọala nke Otu Wikimedia zuru oke na nkà na ụzụ na Africa.

Nke a ka bụ naanị mmalite. Njem dị n’ihu jupụtara na ihe ịma aka, mana ọ juputakwara na ohere. Ma ị ma eji koodu eme ihe ma ọ bụ na-ichọrọ ọchịchọ ịmata ihe dị ka nke s, enwere ohere maka gị na atụmatụ Wiki Mentor Africa.

Sonyere anyị ka anyị na-aga n’ihu na-aluso ihe mgbochi dijitalụ ọgụ, otu hackathon n’otu oge. Na njikọ aka, anyị na agba mbọ hụ na akụkọ Wikimedia dị n’Africa bụ nke nwere nkwado,, imekọ ihe ọnụ, na ichepụta ihe ọhụrụ na-adịghị agwụ agwụ. Njem anyị akwụsịghị ebe a; anyị na-agbasawanye ngalaba anyị site na mmemme kwa ọnwa nke ga- egosipụta ndị enyemaka Wikimedia nwere ahụmahụ ga enye ọmụmụ ihe n’isiokwu teknụzụ. Oge ndị a bụ ohere magburu onwe ya maka onye ọ bụla na-achọ ime ka nghọta na nkà ha dị omimi na oghere teknụzụ Wikimedia. Gee ntị ozi ma sonye site na ịlele ngalaba mmemme na-abịa na ibe Wiki Mentor Africa anyị.

Nye onye nhazi ọ bụla, onye nsonye, onye nkwado, onye ndụmọdụ na ndi nkwado mere Wiki Mentor Africa Hackathon nke afọ 2024 a bụrụ ihe pụtara ihe, anyị na-ekele gị. Ike gị, amamihe na mmụọ amụbaala njem a. Ọchịchọ a na-aga n’ihu, na isiakwụkwọ ọhụrụ ọ bụla, anyị na-esiwanye ike, na-ejikọkwu ọnụ, ma dị njikere ichekọo ọdịnihu ihu ọnụ. Ma ị bụ onye ọhụrụ na ihe omume teknuzu Wikimedia ma ọ bụ onye nnyere aka nwere mmụtara, isonye na mmemme anyị na-abịa nwere ike ịkpalite mgbanwe anyị na-atụanya maka Wikimedia n’Africa. Iso nkwalite n’adịbeghị anya nke sitere na Hackthon anyị, Ngwá Ọrụ ISA dị njikere ugbu a ibuli agbam mbọ anyị kekọrịtara! Ya mere, a na-akpọ gị òkù ka ị sonye na Wiki in Africa nke mgbasa ozi ISA kacha ọhụrụ n’Africa, ụtụ pụrụ iche maka ikike ụmụ nwanyị n’ọnwa, Maachị.

Ka anyị na-aga n’ihu ma mee ka ihe omume ọ bụla bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ na-eute nkwado, imekọ ihe ọnụ na mmepụta ihe ọhụrụ n’ọdịnihu.

Ka anyị mee ka ọkụ nke ihe ọmụma nogide na-achake , nye Africa na Ụwa .

Gukwuo

Can you help us translate this article?

In order for this article to reach as many people as possible we would like your help. Can you translate this article to get the message out?