Mmegharị ọhụụ nke ego enyemaka ọrụ Movement Strategy na nlekwasị anya na Họb!

Translate this post
Movement Charter conversation first event in Rwanda, RebeccaRwanda, CC-BY-SA 4.0

Kemgbe afọ 2022, Ego enyemaka ọrụ nke Mmezu Ntuziaka atụmatụ bụ Movement Strategy Implementation Grant(MSIG) abụrụla isi ihe enyemaka nye ngalaba otu gasị gburugburu Wikimedia, na-enyere ndị otu ngalaba otu aka ịrụ ọrụ dị mkpa dabara na Nlekwasị Ntuziaka Atụmatụ bu Movement Strategy Recomendation. Ego Enyemaka ọrụ ndị a akwadola atụmatụ dị iche iche, gụnyere nnyocha na mmepụta ihe gbasrara họb, ohere mmeme nye ndi ngalaba otu, ịtụgharị asụsụ akwụkwọ dị mkpa, na ịkwalite isonye na atụmatụ Otu. Na mgbakwunye, Ego enyemaka ọrụ ndị a ewepụtala usoro iji nwalee usoro ndu na ikike iwulite nka, na-enyere ndị ngalaba otu aka ichikwa nkenye ọrụ ha na Otu a.

Ka anyị na-atụgharị uche na nganihu emepụtarala, o doro anya na Movement Strategy Impementation Grant ekerewo òkè dị mkpa n’iweta Ntuziaka atụmatụ otu a nso nye Ngalaba otu. Ego Enyemaka ọrụ ndị a enyela ohere ka ọchịchị ọhụrụ, idu ndu, na usoro nsonye ndi ngalaba otu, na ohere nsonye na ntinye aka.

N’ọnwa Julaị 2024, ndị otu a mere ntuliaka maka Movement Charter nke nyere ohere maka ọchịchị nke Otu a. Wikimedia Foundation ghọtara mkpa ọ dị ịkwadọ ọchịchị, na n’imezu ebumnuche a, anyị na-agba mbọ ịkwado atụmatụ Họb na-akwalite mkpebi ziri ezi.

Kedu ihe na-esote? Ndozi na Nlebanya emegharịrị ọhụrụ

Ka anyị na-aga n’ihu, anyị chọrọ ikesa ụfọdụ mmelite dị mkpa nke ga-achịkọba ọdịnihu nke Movement Strategy. Ndị otu mmepe Ngalaba otu bụ Community Development Team, Movement Communications na otu ndị ọzọ nọ na Wikimedia Foundation na-arụkọ ọrụ ọnụ na nkwado nke MSIG na Hubs. Njikọ aka a ga-eme ka nkwado anyị bụrụ nke a na-ahazi na nke zuru oke, na-egbo mkpa dị iche iche nke ngalaba otu na gburugburu Njem a. Anyị nwekwara nkwado oge niile na ndụmọdụ atụmatụ site n’aka Ndị otu Community Resilience and Sustainabilty, na-ewusi mbọ anyị ike.

N’ịga n’ihu, akụkụ dị mkpa a ga-elekwasị anya ga-abụ na Hubs, nke a na-ahụta dị ka akụkụ dị mkpa nke usoro na ọchịchị Njem a n’ọdịnihu. Ego enyemaka ọrụ na nkwado Movement Strategy ga-elekwasị anya na atụmatụ ndị a iji nye nkwado dị mkpa maka Hubs. Anyị na-emelite usoro na usoro ntozu iji gosipụta mgbanwe a. Gee ntị ọkwa na Meta-Wiki!

Maka ndị tinyeburu akwụkwọ maka obere ego enyemaka ọrụ iji kwado ndị nnọchi anya, ntụgharị asụsụ, Nkwalite ndị ndu, na ihe omume ndị yiri ya, anyị ga-eduzi ha gaa na ohere ego enyemaka ọrụ ndị ọzọ n’ime ego Enyemaka ọrụ Wikimedia dị adị, dị ka Rapid na General Support Fund.

Na-enye ezi nghọta na ntuziaka

Akụkụ dị mkpa nke nkwado maka atụmatụ Hub n’usoro ha dị iche iche bụ iwepụta ụkpụrụ nduzi maka njikwa Họb. Ntuziaka a ga-enye usoro ọchịchị, ndị ọrụ, inye ego ọrụ, na ọrụ, na-enwe mgbanwe zuru oke iji daba n’ọnọdụ na mkpa dị iche iche. Otu Community Development ga-agba mbọ n’imegharị ụkpụrụ nduzi ndị a, na-ewulite ụkpụrụ nduzi dị ugbu a, akwụkwọ kọmitii Movement Charter depụtara, na mmụta bara uru site na atụmatụ Hub. Ndị otu ahụ na-ezube njikọ aka ha na ndị na-etinye aka na ọrụ Hub ma kesaa nke a na Meta maka nzaghachi ọhaneze ọ bụla.

Nkwado na nkwurịta okwu na-aga n’ihu

Ọ bụrụ na ị nwere ajụjụ gbasara ego enyemaka ọrụ MSIG ugbu a nakwa nkwado metụtara atụmatụ Hub, anyị na-agba gị ume ịkpọtụrụ Beverly Jiang, Jessica Stephenson, na Sailesh Patnaik si na Otu Community Development na Strategy2030@wikimedia.org. Anyị ga-aga n’ihu na mkparịtaụka anyị na ọtụtụ ndị ntinye akwụkwọ ego enyemaka ọrụ na-aga n’ihu iji ghọta ọrụ a nke ọma ma kparịta usoro ndị nwere ike ibute ịga n’ihu.

Anyị nwere obi ụtọ maka ntụzịaka anyị ma na-atụ anya ka anyị na unu niile na-arụkọ ọrụ ka anyị na-ewulite Njem siri ike na nke ziri ezi.

Can you help us translate this article?

In order for this article to reach as many people as possible we would like your help. Can you translate this article to get the message out?